ABÙ ỌMA 33:18-22
ABÙ ỌMA 33:18-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ONYENWE ANYị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche, ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ. Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ. Anyị ji olileanya eche ONYENWE ANYị; ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị. Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya; nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi. O ONYENWE ANYị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị, dịka olileanya anyị dị na gị.
ABÙ ỌMA 33:18-22 Bible Nso (IGBOB)
Le, anya Jehova di n'aru ndi nātu egwu Ya, Bú n'aru ndi nēchere ebere-Ya; Inaputa nkpuru-obi-ha n'ọnwu, Na idebe ha ndu n'oké unwu. Nkpuru-obi-ayi echerewo Jehova: Iye-aka-ayi na ọta-ayi ka Ọ bu. N'ihi na ọ bu nime Ya ka obi-ayi nāṅuri ọṅu, N'ihi na ọ bu aha nsọ Ya ka ayi tukwasiworo obi. Jehova, ka ebere-Gi dikwasi ayi, Dika ayi chereworo Gi.