ABÙ ỌMA 31:19-24
ABÙ ỌMA 31:19-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Lee ka ịdị mma gị si baa ụba, nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị, nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị, nʼihu ọha mmadụ. I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ; ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị; ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche. Otuto dịrị ONYENWE ANYị nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu. Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị, “Ewezugala m site nʼihu ya!” Ma ị nụrụ arịrịọ m maka ebere mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka. Hụnụ ONYENWE ANYị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi, nʼihi na ONYENWE ANYị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya, ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu. Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike, unu niile ndị olileanya ha dị nʼime ONYENWE ANYị.
ABÙ ỌMA 31:19-24 Bible Nso (IGBOB)
Le ka ezi ihe-Gi si ba uba, nke I tukọbaworo nye ndi nātu egwu Gi, Nke I luworo nye ndi nāb͕abà nime Gi n'iru umu madu! I nēzobe ha n'ebe-nzuzo nke iru-Gi ka ha pua n'aka nkekọta nile nke madu: I nēdebe ha na nzuzo n'ulo-ntu ka ha pua n'ise-okwu nke ire di iche iche. Onye agọziri agọzi ka Jehova bu: N'ihi na O mewo ka ebere-Ya di ebube n'ebe m'nọ n'obodo ewusiri ike. Ma mu onwem, asirim na nkujam, Ebipuwom n'anya-Gi: Otú ọ di, I nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi. Hunu Jehova n'anya, ndi-ebere-Ya nile: Ọ bu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka Jehova nēchezi, Ọ nākwughachibiga kwa onye nēme omume npako ókè. Dinu ike, ka obi-unu nwe kwa ume, Unu nile ndi nēchere Jehova.