Lee ka ịdị mma gị si baa ụba, nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị, nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị, nʼihu ọha mmadụ. I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ; ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị; ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche. Otuto dịrị ONYENWE ANYị nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu. Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị, “Ewezugala m site nʼihu ya!” Ma ị nụrụ arịrịọ m maka ebere mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka. Hụnụ ONYENWE ANYị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi, nʼihi na ONYENWE ANYị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya, ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu. Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike, unu niile ndị olileanya ha dị nʼime ONYENWE ANYị.
Gụọ Abụ Ọma 31
Geere nke a ntị Abụ Ọma 31
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 31:19-24
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị