Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 31:1-24

ABÙ ỌMA 31:1-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

ONYENWE ANYị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m; site nʼezi omume gị gbapụta m. Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m, bịa ngwangwa gbapụta m; ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m. Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike, nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m. Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m, nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike. Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m; gbapụta m, o ONYENWE ANYị, Chineke, onye eziokwu. Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru; ana m atụkwasị ONYENWE ANYị obi m. Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị, nʼihi na ị hụrụ nsogbu m marakwa ihe mgbu nke mmụọ m. I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m, kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ. O ONYENWE ANYị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m. Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa; ike adịghịkwa m. Iru ụjụ eriela m ahụ; ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m; ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa m ruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m. Nʼihi ndị iro m niile; ndị agbataobi m na-elelị m anya. Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m, ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee. Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ. A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m. Anụla m nkwulu ha megide m; oke egwu dị nʼakụkụ niile; ha na-agba izu megide m, na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m. Ma ana m atụkwasị gị obi ONYENWE ANYị. Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.” Oge m niile dị gị nʼaka. Napụta m nʼaka ndị iro m na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ. Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ; zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ. O ONYENWE ANYị, ekwela ka ihere mee m, nʼihi na akpọkuola m gị; kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ, ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu. Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam; nʼihi na ọ bụ site na mpako na nlelị ka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume. Lee ka ịdị mma gị si baa ụba, nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị, nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị, nʼihu ọha mmadụ. I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ; ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị; ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche. Otuto dịrị ONYENWE ANYị nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu. Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị, “Ewezugala m site nʼihu ya!” Ma ị nụrụ arịrịọ m maka ebere mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka. Hụnụ ONYENWE ANYị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi, nʼihi na ONYENWE ANYị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya, ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu. Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike, unu niile ndị olileanya ha dị nʼime ONYENWE ANYị.

ABÙ ỌMA 31:1-24 Bible Nso (IGBOB)

Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo; ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi: N'ezi omume-gi me ka m'b͕apu. Tọrọm nti-Gi n'ala; naputam ngwa ngwa: Ghọrọm oké nkume nke ebe siri ike, bú ulo nke ebe ewusiri ike nke-uku izọputam. N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu; Ọzọ, n'ihi aha-Gi I gēdum, dukwam nwayo. I gēme ka m'si n'ub͕u nke ha zoberem puta; N'ihi na Gi onwe-gi bu ebem siri ike. N'aka-Gi ka m'nēnye mọm idebe: I b͕aputawom, Jehova, Chineke nke ezi-okwu. Akpọwom ha asì, bú ndi nāriba ihe-efu nile nke nābughi ihe ama: Ma mu onwem atukwasiwo obi na Jehova. Ka m'tegharia egwú ọṅu, ṅuri kwa ọṅu, n'ebere-Gi: N'ihi na I huwo nweda-n'alam; I mawo nkpuru-obim n'ahuhu di iche iche: I mechibidoghkwam nye n'aka onye-iro; I mewo ka ukwum abua guzo n'ebe sara mbara. Merem amara, Jehova, n'ihi na anọm na nkpab͕u: Anyam emebiwo nime nkpasu-iwem, ya na nkpuru-obim, na afọm, dika uwe nla mebiri. N'ihi na ndum agwusiwo n'iru-újú, na arọm nile n'ize-ume: Ikem asuwo ngọngọ site n'ajọ omumem, ọkpukpum nile emebiwo kwa, dika uwe nla mebiri. N'ihi ndi-nkpab͕um nile aghọwom ihe-ita-uta nke-uku, Ọbuná n'ebe ndi-ab͕ata-obim nọ aghọwo-kwa-ram ndi m'mara oké egwu: Ndi nāhum n'èzí ab͕anariwom. Echezọwo mu onwem dika onye nwuru anwu puru n'obi madu: Aghọwom ihe nāla n'iyì. N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, Ujọ dim buruburu: Mb͕e ha nāb͕a ìzù n'otù imegidem, Ha zubere iwepu ndum. Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tukwasiworo obi, Jehova: Asiwom, Chinekem ka I bu. N'aka-Gi ka mb͕em nile di: Naputam n'aka ndi-irom, na n'aka ndi nēsob͕um. Me ka iru-Gi nye orù-gi ìhè: Zọputam n'ihi ebere-Gi. Jehova, ekwela ka ihere mem; n'ihi na akpọkuwom I: Ka ihere me ndi nēmebi iwu, ka ha debe ọnu-ha du n'ala-mọ. Ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha da ob͕i; Nke nēkwu oké okwu megide onye ezi omume, Nime npako na nleda-anya. Le ka ezi ihe-Gi si ba uba, nke I tukọbaworo nye ndi nātu egwu Gi, Nke I luworo nye ndi nāb͕abà nime Gi n'iru umu madu! I nēzobe ha n'ebe-nzuzo nke iru-Gi ka ha pua n'aka nkekọta nile nke madu: I nēdebe ha na nzuzo n'ulo-ntu ka ha pua n'ise-okwu nke ire di iche iche. Onye agọziri agọzi ka Jehova bu: N'ihi na O mewo ka ebere-Ya di ebube n'ebe m'nọ n'obodo ewusiri ike. Ma mu onwem, asirim na nkujam, Ebipuwom n'anya-Gi: Otú ọ di, I nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi. Hunu Jehova n'anya, ndi-ebere-Ya nile: Ọ bu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka Jehova nēchezi, Ọ nākwughachibiga kwa onye nēme omume npako ókè. Dinu ike, ka obi-unu nwe kwa ume, Unu nile ndi nēchere Jehova.