ONYENWE ANYị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ;
ekwela ka ihere mee m;
site nʼezi omume gị gbapụta m.
Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m,
bịa ngwangwa gbapụta m;
ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,
ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m.
Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike,
nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m.
Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m,
nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike.
Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m;
gbapụta m, o ONYENWE ANYị, Chineke, onye eziokwu.
Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru;
ana m atụkwasị ONYENWE ANYị obi m.
Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị,
nʼihi na ị hụrụ nsogbu m
marakwa ihe mgbu nke mmụọ m.
I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m,
kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ.
O ONYENWE ANYị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m.
Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa;
ike adịghịkwa m.
Iru ụjụ eriela m ahụ;
ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m;
ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa m
ruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m.
Nʼihi ndị iro m niile;
ndị agbataobi m na-elelị m anya.
Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m,
ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee.
Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ.
A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m.
Anụla m nkwulu ha megide m;
oke egwu dị nʼakụkụ niile;
ha na-agba izu megide m,
na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m.
Ma ana m atụkwasị gị obi ONYENWE ANYị.
Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.”
Oge m niile dị gị nʼaka.
Napụta m nʼaka ndị iro m
na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ.
Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ;
zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ.
O ONYENWE ANYị, ekwela ka ihere mee m,
nʼihi na akpọkuola m gị;
kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ,
ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu.
Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam;
nʼihi na ọ bụ site na mpako na nlelị
ka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume.
Lee ka ịdị mma gị si baa ụba,
nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị,
nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị,
nʼihu ọha mmadụ.
I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị
pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ;
ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị;
ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche.
Otuto dịrị ONYENWE ANYị
nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu
mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu.
Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị,
“Ewezugala m site nʼihu ya!”
Ma ị nụrụ arịrịọ m maka ebere
mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka.
Hụnụ ONYENWE ANYị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi,
nʼihi na ONYENWE ANYị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya,
ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu.
Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike,
unu niile ndị olileanya ha dị nʼime ONYENWE ANYị.