ABÙ ỌMA 3:3-6
ABÙ ỌMA 3:3-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma gị, ONYENWE ANYị bụ ọta na-ekpuchi m; I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ. Etikuru m ONYENWE ANYị mkpu akwa, ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela Edinara m ala, hie ụra, ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na ONYENWE ANYị na-eche m nche. A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu, agaghị m atụ egwu ọbụla.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 3ABÙ ỌMA 3:3-6 Bible Nso (IGBOB)
Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum, Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu. Ejim olum kpọkue Jehova, O we zam site n'ugwu nsọ Ya. Mu onwem dinara ala, raru ura; Etetaram; n'ihi na Jehova nākwagidem. M'gaghi-atu egwu ìgwè ndi nkem anāpughi iguta aguta, Ndi doworo onwe-ha imegidem buruburu.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 3