ABÙ ỌMA 28:6-9
ABÙ ỌMA 28:6-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Toonu ONYENWE ANYị, nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere. ONYENWE ANYị bụ ike m na ọta m; ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka. Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ, aga m ejikwa abụ m na-eto ya. ONYENWE ANYị bụ ike nke ndị ya, ebe mgbaba e wusiri ike nke nzọpụta dịịrị onye ya etere mmanụ. Zọpụta ndị gị, gọzikwaa ihe nketa gị; buuru ha onye ọzụzụ atụrụ, na-ekukwa ha ruo mgbe ebighị ebi.
ABÙ ỌMA 28:6-9 Bible Nso (IGBOB)
Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, N'ihi na Ọ nuwo olu aririọ-amaram nile. Jehova bu ikem na ọtam; Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka: Obim we nāwuli elu n'ọṅù; M'gēsite kwa n'abùm kele Ya. Jehova buru ya ike, Ebe siri ike nke nzọputa nke onye nke Ya etere manu ka Ọ bu. Zọputa ndi-Gi, gozi kwa ihe-nketa-Gi: Nāzù kwa ha dika aturu, nēku kwa ha n'aka-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.