Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 27:1-14

ABÙ ỌMA 27:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

ONYENWE ANYị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? ONYENWE ANYị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa. Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; ọ bụladị na agha adaa imegide m, nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi. Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka ONYENWE ANYị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ ONYENWE ANYị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma ONYENWE ANYị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume. Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye ONYENWE ANYị. Gee ntị mgbe m na-akpọku gị ONYENWE ANYị. Meere m ebere, zaa m. Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, ONYENWE ANYị, ka m ga-achọ. Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O Chineke, Onye nzọpụta m, ahapụkwala m. Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m, ONYENWE ANYị ga-anabata m. Zi m ụzọ gị, O ONYENWE ANYị; duo m nʼụzọ kwesiri nʼihi ndị na-akpagbu m. Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha, ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m, ha na-ekupụ ihe ike dịka ume. Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma ONYENWE ANYị nʼala ndị dị ndụ. Chere ONYENWE ANYị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere ONYENWE ANYị.

ABÙ ỌMA 27:1-14 Bible Nso (IGBOB)

Jehova bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m'gātu egwu? Jehova bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m'gātu oké egwu? Mb͕e ndi nēme ihe ọjọ biarurum nso iri anu-arum, Bú ndi nākpab͕um na ndi-irom, ha onwe-ha suru ngọngọ, da n'ala. Ọ buru na ọmuma-ulo-ikwū ndi-agha ama ulo-ikwū-ha imegidem, Obim agaghi-atu egwu: Ọ buru na agha ebilie imegidem, Na nka ka mu onwem nātukwasi obi. Otù ihe ka m'riọworo n'aka Jehova, nke ahu ka m'nāchọ; Ọ bu ka m'biri n'ulo Jehova ubọchi nile nke ndum, Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n'ulo uku Ya. N'ihi na Ọ gēdebem na nzuzo n'ulo-ntu-Ya n'ubọchi ihe ọjọ: Ọ gēzobem n'ebe-nzuzo nke ulo-ikwū-Ya; N'oké nkume ka Ọ gēbulim elu. Ma ub͕u a agēbuli isim elu n'elu ndi-irom dim buruburu; M'ga-achukwa àjà nke iti-nkpu n'ulo-ikwū-Ya; M'gābù abù, m'gābùku kwa Jehova abù ọma. Jehova, nuru mb͕e m'were olum kpọ òkù: Me-kwa-ram amara, zakwam. Gi ka obim siworo, Gi kwuru okwu, si, Chọnu irum; Iru-Gi, Jehova, ka m ga-achọ. Ezonarilam iru-Gi; Ejila iwe wezuga orù-Gi: Iye-akam ka I buworo; Ab͕anarilam, arapu-kwa-lam, Chineke nke nzọputam. N'ihi na nnam na nnem arapuwom, Ma Jehova gēkubatam. Jehova, zím uzọ-Gi; Durukwam n'okporo-uzọ di lari, N'ihi ndi nēchem anwu. Enyelam n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi nākpab͕um: N'ihi na ndi-àmà okwu-ugha ebiliwo imegidem, ha na ndi nēkupu ihe-ike dika ume. M'gēme aṅa ma asi na ekweghm na m'gēle idi-nma Jehova N'ala ndi di ndu? Nēle anya Jehova: Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume; E, nēle anya Jehova.