Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 27:1-14

Abụ Ọma 27:1-14 BIU

ONYENWE ANYị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? ONYENWE ANYị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa. Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; ọ bụladị na agha adaa imegide m, nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi. Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka ONYENWE ANYị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ ONYENWE ANYị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma ONYENWE ANYị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume. Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye ONYENWE ANYị. Gee ntị mgbe m na-akpọku gị ONYENWE ANYị. Meere m ebere, zaa m. Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, ONYENWE ANYị, ka m ga-achọ. Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O Chineke, Onye nzọpụta m, ahapụkwala m. Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m, ONYENWE ANYị ga-anabata m. Zi m ụzọ gị, O ONYENWE ANYị; duo m nʼụzọ kwesiri nʼihi ndị na-akpagbu m. Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha, ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m, ha na-ekupụ ihe ike dịka ume. Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma ONYENWE ANYị nʼala ndị dị ndụ. Chere ONYENWE ANYị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere ONYENWE ANYị.

Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara Abụ Ọma 27:1-14