ABÙ ỌMA 26:1-12
ABÙ ỌMA 26:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị, biko kpepụta m, nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke; atụkwasịrị m ONYENWE ANYị obi, na-eleghị anya nʼazụ. Tulee m, O ONYENWE ANYị, ma nwakwaa m, nyochaa obi m na echiche m. Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m. Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị. Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla. Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ. Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị. Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa. Ana m asacha aka m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ, na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o ONYENWE ANYị. Ana m abụkwa abụ ekele, jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile. O ONYENWE ANYị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya, ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya. Ebibikọtala mụ na ndị mmehie, ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara, ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ, aka nri ha jupụtakwara na ngarị. Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke; gbapụta m ma meere m ebere. Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị; aga m eto ONYENWE ANYị nʼetiti ọha mmadụ.
ABÙ ỌMA 26:1-12 Bible Nso (IGBOB)
Kpem ikpe, Jehova, n'ihi na mu onwem ejewo ije n'izu-okèm: Ọ bu kwa na Jehova ka m'tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu. Nwà m, Jehova, nwaputakwam; Nucha akurum abua na obim. N'ihi na ebere-Gi di n'iru anyam; Ejeghariwokwam n'ezi-okwu-Gi. Mu na madu efu anọkọghi; Mu na ndi-iru-abua adighi-abàkọ kwa. Akpọwom nkpọkọta ndi nēme ihe ọjọ asì, Mu na ndi nēmebi iwu adighi-anọkọ kwa. Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ; We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova: Ime ka ege nti olu ekele, Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile. Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n'anya, Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi. Achikọtala nkpuru-obim na ndi-nmehie n'otù, Achikọta-kwa-la ndum na ndi-ọbara n'otù: Ndi nzube ọjọ di n'ka-ha, Aka-nri-ha juputa-kwa-ra n'iri-ngo. Ma mu onwem, n'izu-okèm ka m'gēje ije: B͕aputam, me-kwa-ram amara. Ukwum eguzowo n'ala di lari: Nime nkpọkọta madu nile ka m'gāgọzi Jehova.