ABÙ ỌMA 21:1-13
ABÙ ỌMA 21:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, lee na eze na-aṅụrị ọṅụ nʼike gị. Obi na-atọkwa ya ụtọ nke ukwuu nʼihi mmeri niile i nyere ya! I nyela ya ihe obi ya chọrọ; i mekwaara ya ihe niile ọ rịọrọ gị! Sela I ji ngọzị bara ụba nabata ya, ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi. Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya, ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya. Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị. Nʼihi na eze na-atụkwasị ONYENWE ANYị obi, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile; aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị. Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ, ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Nʼoke iwe ya, ONYENWE ANYị ga-elo ha, ọkụ ya ga-erepịakwa ha. Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi, ụmụ ha kwa site, nʼetiti ụmụ mmadụ. Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị, maọbụ tụpụta atụmatụ ọjọọ, ha agaghị emezu ebumnuche ha. Nʼihi na i ga-eme ka ha gbaghachi azụ mgbe i kwere ụta gị tụgide ha nʼihu. O ONYENWE ANYị, ka e bulie gị elu nʼihi ike gị; anyị ga-abụ abụ ma tokwaa ike gị.
ABÙ ỌMA 21:1-13 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, n'ike-Gi ka eze nāṅuri ọṅu; Le kwa otú ọ nēteghari egwú ọṅù nke-uku na nzọputa-Gi! Ọ bu ihe obi-ya nāchọsi ike ka I nyeworo ya, I b͕ochighi kwa arirọ eb͕ub͕ere-ọnu-ya. Selah N'ihi na I ji ngọzi nke ọdi-nma zute ya: I nātukwasi okpu-eze nke ọla-edo anuchara anucha n'isi-ya. Ndu ka Ọ riọrọ n'aka-Gi, I nyewo ya ndu ahu, Bú ubọchi ndu di ogologo rue mb͕e nile ebighi-ebi. Nsọpuru-ya di uku na nzọputa-Gi: Ebube na ima-nma ka I nātukwasi ya. N'ihi na I nēme ya ka ọ buru ngọzi rue mb͕e ebighi-ebi: I nēwere ọṅù me ka ọ ṅuria n'iru Gi. N'ihi na eze nātukwasi Jehova obi, Site kwa n'ebere nke Onye kachasi ihe nile elu agaghi-ewuzuga ya n'ọnọdu-ya. Aka-Gi gāchọputa ndi-iro-Gi nile: Aka-nri-Gi gāchọputa ndi nākpọ Gi asì. I gēme ha ka ha di ka ite-ọku uku di ọku na mb͕e I ji me ka ha hu iru-Gi: Jehova gēloda ha n'iwe-Ya, Ọku gēripia kwa ha. I gēme ka nkpuru-ha si n'uwa la n'iyì, Umu-ha kwa, site n'etiti umu madu. N'ihi na ha setipuru ihe ọjọ megide Gi: Ha chère ihe-nzube nke ha nāpughi ime. N'ihi na I gēme ka ha b͕akuta azu, I gēji udọ̀-uta-I dozi àkú imegide ha n'iru. Jehova, me Onwe-gi ka I di elu n'ike-Gi: Ayi gābù abù, bùku kwa idi-ike-Gi abù ọma.