Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 21

21
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.
1Jehova, n'ike-Gi ka eze nāṅuri ọṅu;
Le kwa otú ọ nēteghari egwú ọṅù nke-uku na nzọputa-Gi!
2Ọ bu ihe obi-ya nāchọsi ike ka I nyeworo ya,
I b͕ochighi kwa arirọ eb͕ub͕ere-ọnu-ya. Selah
3N'ihi na I ji ngọzi nke ọdi-nma zute ya:
I nātukwasi okpu-eze nke ọla-edo anuchara anucha n'isi-ya.
4Ndu ka Ọ riọrọ n'aka-Gi, I nyewo ya ndu ahu,
Bú ubọchi ndu di ogologo rue mb͕e nile ebighi-ebi.
5Nsọpuru-ya di uku na nzọputa-Gi:
Ebube na ima-nma ka I nātukwasi ya.
6N'ihi na I nēme ya ka ọ buru ngọzi rue mb͕e ebighi-ebi:
I nēwere ọṅù me ka ọ ṅuria n'iru Gi.
7N'ihi na eze nātukwasi Jehova obi,
Site kwa n'ebere nke Onye kachasi ihe nile elu agaghi-ewuzuga ya n'ọnọdu-ya.
8Aka-Gi gāchọputa ndi-iro-Gi nile:
Aka-nri-Gi gāchọputa ndi nākpọ Gi asì.
9I gēme ha ka ha di ka ite-ọku uku di ọku na mb͕e I ji me ka ha hu iru-Gi:
Jehova gēloda ha n'iwe-Ya,
Ọku gēripia kwa ha.
10I gēme ka nkpuru-ha si n'uwa la n'iyì,
Umu-ha kwa, site n'etiti umu madu.
11N'ihi na ha setipuru ihe ọjọ megide Gi:
Ha chère ihe-nzube nke ha nāpughi ime.
12N'ihi na I gēme ka ha b͕akuta azu,
I gēji udọ̀-uta-I dozi àkú imegide ha n'iru.
13Jehova, me Onwe-gi ka I di elu n'ike-Gi:
Ayi gābù abù, bùku kwa idi-ike-Gi abù ọma.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 21: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara