ABÙ ỌMA 2:1-12
ABÙ ỌMA 2:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Gịnị mere mba niile ji agba izu nzuzo? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru? Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa imegide ONYENWE ANYị na imegide Onye ya e tere mmanụ. Ha na-asị, “Ka anyị tijie mkpọrọ igwe niile ha kere anyị ma tufukwaa ha, nwere onwe anyị.” Onye na-anọdụ nʼeluigwe na-achị ọchị. Onyenwe anyị na-akwa ha emo. Mgbe ahụ, ọ na-eji iwe baara ha mba mee ka ụjọ jupụta ha obi nʼihi oke iwe ya. “Mụ onwe m eguzobela m eze m na Zayọn, ugwu m dị nsọ.” Aga m ekwusa iwu ONYENWE ANYị: Ọ sịrị m, “Ị bụ Ọkpara m; taa abụrụla m nna gị. Rịọọ m, aga m enye gị mba niile nke ụwa ka ha bụrụ ihe nketa gị. Ị ga-eji mkpara igwe chịa ha, tipịa ha dịka onye na-akpụ ite si etipịa ite ndị ọ kpụrụ na-adịghị mma.” Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche; ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa. Jirinụ ịtụ egwu fee ONYENWE ANYị ofufe; jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya. Sutukwanụ Ọkpara ahụ ọnụ ka iwe ghara iwe ya, ka unu ghara ị bụ ndị a lara nʼiyi nʼụzọ unu. Nʼihi na iwe ya pụrụ ịmalite nʼotu ntabi anya. Ndị niile na-eme ya ebe mgbaba ha bụ ndị a gọziri agọzi.
ABÙ ỌMA 2:1-12 Bible Nso (IGBOB)
N'ìhi gini ka mba nile meworo oké nkpọtu? N'ìhi gini ka ndi nile di n'uwa nātughari ihe-efu n'uche? Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha, Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù, Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si, Ka ayi tijie ab͕u nile ha, Tufue udọ̀ nile ha n'aru ayi. Onye nānọdu n'elu-igwe nāchi ọchì: Onye-nwe-ayi nākwa ha emò. Mb͕e ahu Ọ gāgwa ha okwu n'iwe-Ya, Ọ bu kwa n'iwe-Ya di ọku ka Ọ gēme ka ha ma jijiji: Ma Mu onwem emewo ka ezem guzosie ike N'elu Zaion, bú ugwu nsọm. M'gākọ akukọ bayere ukpuru: Jeohva sirim, Ọkparam ka gi onwe-gi bu; Mu onwem amuwo gi ta. Riọm, na agamenye gi mba nile ka ha buru ihe-nketa-gi, Na nsọtu uwa ka ha buru ihe-onwunwe-gi. I gēji nkpa-n'aka ígwè tijisi ha; Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha. Ma ub͕u a, ndi-eze, nwenu uche: Ka adọ unu aka na nti, ndi-ikpe nke uwa. Werenu egwu fè Jehova òfùfè, Were-kwa-nu ọma-jijiji tegharia egwú ọṅù. Sutunu onye arọputaworo ọnu, ka ọ ghara iwe iwe, unu we la n'iyì n'uzo, N'ihi na iwe-ya gēre ọku na mb͕e ntà. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ha bu, bú ndi nile nāb͕abà nime ya.