Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 2:1-12

Abụ Ọma 2:1-12 BIU

Gịnị mere mba niile ji agba izu nzuzo? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru? Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa imegide ONYENWE ANYị na imegide Onye ya e tere mmanụ. Ha na-asị, “Ka anyị tijie mkpọrọ igwe niile ha kere anyị ma tufukwaa ha, nwere onwe anyị.” Onye na-anọdụ nʼeluigwe na-achị ọchị. Onyenwe anyị na-akwa ha emo. Mgbe ahụ, ọ na-eji iwe baara ha mba mee ka ụjọ jupụta ha obi nʼihi oke iwe ya. “Mụ onwe m eguzobela m eze m na Zayọn, ugwu m dị nsọ.” Aga m ekwusa iwu ONYENWE ANYị: Ọ sịrị m, “Ị bụ Ọkpara m; taa abụrụla m nna gị. Rịọọ m, aga m enye gị mba niile nke ụwa ka ha bụrụ ihe nketa gị. Ị ga-eji mkpara igwe chịa ha, tipịa ha dịka onye na-akpụ ite si etipịa ite ndị ọ kpụrụ na-adịghị mma.” Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche; ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa. Jirinụ ịtụ egwu fee ONYENWE ANYị ofufe; jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya. Sutukwanụ Ọkpara ahụ ọnụ ka iwe ghara iwe ya, ka unu ghara ị bụ ndị a lara nʼiyi nʼụzọ unu. Nʼihi na iwe ya pụrụ ịmalite nʼotu ntabi anya. Ndị niile na-eme ya ebe mgbaba ha bụ ndị a gọziri agọzi.