ABÙ ỌMA 18:1-6
ABÙ ỌMA 18:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m. ONYENWE ANYị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya. Akpọkuru m ONYENWE ANYị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m. Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ; ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m. Ụdọ nke ili kere m gburugburu, ọnya nke ọnwụ guzogidere m. Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m ONYENWE ANYị; etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka; akwa m rutekwara ya ntị, o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
ABÙ ỌMA 18:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Anamahu Gi n'anya nke-uku, Jehova, bú ikem. Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu; Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum. Onye anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova: Ewe zọputam n'aka ndi-irom. Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu, Miri-iyi nile nke ihe jọb͕uru onwe-ya nēme kwa ka m'tua egwu. Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu: Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum. Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam, Ọ bu Chinekem ka m'nētiku: O nēsi n'ulo uku Ya nu olum, Nkpu m'tikuru Ya we ba na nti-Ya abua.