O ONYENWE ANYị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m. ONYENWE ANYị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya. Akpọkuru m ONYENWE ANYị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m. Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ; ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m. Ụdọ nke ili kere m gburugburu, ọnya nke ọnwụ guzogidere m. Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m ONYENWE ANYị; etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka; akwa m rutekwara ya ntị, o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
Gụọ Abụ Ọma 18
Geere nke a ntị Abụ Ọma 18
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 18:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị