ABÙ ỌMA 149:1-9
ABÙ ỌMA 149:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Toonu ONYENWE ANYị! Bụkuonụ ONYENWE ANYị abụ ọhụrụ. Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya. Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha; ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha. Ka ha jiri ite egwu too aha ya ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu. Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ ONYENWE ANYị ụtọ. Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze. Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a, bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha. Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha, ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha, iji bọọrọ mba niile ọbọ taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ, iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe, imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha. Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya.
ABÙ ỌMA 149:1-9 Bible Nso (IGBOB)
Tonu Ja. Bùkuenu Jehova abù ọhu, Bú otuto-Ya nime nkpọkọta ndi-ebere-Ya. Ka Israel ṅuria n'Onye meworo ya: Ka umu Zaion tegharia egwú ọṅù n'Eze-ha. Ka ha to aha-Ya n'ite-egwú: Ka ha chiri egwú-otiti na ubọakwara bùkue Ya abù ọma. N'ihi na ihe ndi-Ya nātọ Jehova utọ: Ọ gēji nzọputa chọ ndi di ume-ala n'obi nma. Ka ndi-ebere ṅuri ọṅu-agha nime nsọpuru: Ka ha tie nkpu ọṅò n'elu ihe-ndina-ha. Ka nbuli-elu Chineke di n'olu abu ha, Ka mma-agha nke iru abua di kwa n'aka-ha; Ibọ̀ ọ́bọ̀ n'aru mba nile, Ibara ndi nile di iche iche nba; Iji nkpọrọ ke ndi-eze-ha, Na iji nkpọro-ukwu ígwè ke ndi-ha anāsọpuru; Ime n'aru ha ikpé edere n'akwukwọ: Ihe mara nma ka ọ bu nke ndi-ebere-Ya nile nwere. Tonu Ja.