ABÙ ỌMA 148:1-14
ABÙ ỌMA 148:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Toonu ONYENWE ANYị. Toonu ONYENWE ANYị site nʼeluigwe, toonu ya nʼebe niile kachasị elu. Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile. Toonu ya, anyanwụ na ọnwa toonu ya, kpakpando niile. Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe. Ka ha niile too aha ONYENWE ANYị, nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya. O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi; o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga. Toonu ONYENWE ANYị, site nʼụwa, unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile, na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile, na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu, unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile, na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile, ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa, ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, ndị okenye na ụmụntakịrị. Ka ha niile too aha ONYENWE ANYị, nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa. O meela ka mpi ndị ya dị elu, otuto ndị nsọ ya niile, nke Izrel ndị ọ hụrụ nʼanya.
ABÙ ỌMA 148:1-14 Bible Nso (IGBOB)
Tonu Ja. Tonu Jehova site n'elu-igwe: Tonu Ya n'ebe di elu. Tonu Ya, ndi-mọ-ozi-Ya nile: Tonu Ya, usu-ndi-agha-Ya nile. Tonu Ya, anyanwu na ọnwa: Tonu Ya, kpakpando nile nke ìhè. Tonu Ya, elu-igwe nke elu-igwe, Na miri nke di n'elu elu-igwe. Ka ha to aha Jehova: N'ihi na Ya onwe-ya nyere iwu, ewe kè ha. O we me ka ha guzo rue mb͕e nile ebighi-ebi: Ukpuru ka Ọ nyeworo nke na-agaghi agabiga. Tonu Jehova site n'uwa, Unu ogologo anu-miri, na ob͕u-miri nile: Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu: Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya: Ugwu nile na ugwu ntà nile; Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile: Anu-ọhia na anu-ulo nile; Ihe nākpu akpu na nnunu nwere nkù: Ndi-eze uwa na ndi nile di iche iche; Ndi-isi na ndi-ikpé nile nke uwa: Ma umu-okorọbia ma umu-ab͕ọghọ; Ndi-agadi, ha na umu-ntakiri: Ka ha too aha Jehova; N'ihi na emewo ka aha-Ya di elu, nání ya: Ebube-Ya di n'elu uwa na elu-igwe. O we me ka mpi ndi-Ya nwere di elu, Iburu ndi-ebere-Ya nile otuto; Bú umu Israel, ndi di nso Ya. Tonu Ja.