Toonu ONYENWE ANYị. Toonu ONYENWE ANYị site nʼeluigwe, toonu ya nʼebe niile kachasị elu. Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile. Toonu ya, anyanwụ na ọnwa toonu ya, kpakpando niile. Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe. Ka ha niile too aha ONYENWE ANYị, nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya. O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi; o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga. Toonu ONYENWE ANYị, site nʼụwa, unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile, na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile, na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu, unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile, na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile, ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa, ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, ndị okenye na ụmụntakịrị. Ka ha niile too aha ONYENWE ANYị, nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa. O meela ka mpi ndị ya dị elu, otuto ndị nsọ ya niile, nke Izrel ndị ọ hụrụ nʼanya.
Gụọ Abụ Ọma 148
Geere nke a ntị Abụ Ọma 148
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 148:1-14
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị