ABÙ ỌMA 136:1-26
ABÙ ỌMA 136:1-26 Bible Nso (IGBOB)
Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Kelenu Chineke kachasi chi nile: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Kelenu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Kelenu Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Kelenu Onye ji nghọta eme elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Kelenu Onye meworo ala ka ọ sa mbara n'elu miri: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: Kelenu Onye meworo ìhè uku di iche iche: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: Bú anyuanwu ichi n'ehihie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Na ọnwa na kpakpando ichi n'abali: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Kelenu Onye nētib͕u Ijipt nime umu-ha eburu uzọ mu: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: O we me ka Israel si n'etiti ha puta: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: Site n'aka di ike na n'ogwe-aka esetiri eseti: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Kelenu Onye kebiworo Oké Osimiri Uhie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: O we me ka Israel gabiga n'etiti ya: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: Ma O rurupuru Fero na usu-ndi-agha-ya n'Oké Osimiri Uhie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n'ọzara: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di. Kelenu Onye tib͕uworo ndi-eze di uku: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: O b͕u-kwa-ra ndi-eze di ebube: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: Bú Saihon eze ndi-Amorait: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: Na Og eze Beshan: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: O we nye ala-ha ibu ihe-nketa: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: Iburu Israel, bú orù-Ya, ihe-nketa: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Onye chetara ayi n'ọnọdu-ayi di ala: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: O we naputa ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi. N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Ọ nēnye anu-aru nile nri: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Kelenu Chineke nke elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
ABÙ ỌMA 136:1-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Keleenụ ONYENWE ANYị, nʼihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Na Ọg eze Bashan, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Were ala ha nye dịka ihe nketa, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.