Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 136

136
1Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
2Kelenu Chineke kachasi chi nile:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
3Kelenu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
4Kelenu Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
5Kelenu Onye ji nghọta eme elu-igwe:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
6Kelenu Onye meworo ala ka ọ sa mbara n'elu miri:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
7Kelenu Onye meworo ìhè uku di iche iche:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
8Bú anyuanwu ichi n'ehihie:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
9Na ọnwa na kpakpando ichi n'abali:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
10Kelenu Onye nētib͕u Ijipt nime umu-ha eburu uzọ mu:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
11O we me ka Israel si n'etiti ha puta:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
12Site n'aka di ike na n'ogwe-aka esetiri eseti:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
13Kelenu Onye kebiworo Oké Osimiri Uhie:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
14O we me ka Israel gabiga n'etiti ya:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
15Ma O rurupuru Fero na usu-ndi-agha-ya n'Oké Osimiri Uhie:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
16Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n'ọzara:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di.
17Kelenu Onye tib͕uworo ndi-eze di uku:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
18O b͕u-kwa-ra ndi-eze di ebube:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
19Bú Saihon eze ndi-Amorait:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
20Na Og eze Beshan:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
21O we nye ala-ha ibu ihe-nketa:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
22Iburu Israel, bú orù-Ya, ihe-nketa:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
23Onye chetara ayi n'ọnọdu-ayi di ala:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
24O we naputa ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi.
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
25Ọ nēnye anu-aru nile nri:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
26Kelenu Chineke nke elu-igwe:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 136: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye