ABÙ ỌMA 13:1-6
ABÙ ỌMA 13:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēchezọm ebighi-ebi? Rùe ole mb͕e ka I gēzonarim iru-Gi? Rùe ole mb͕e ka m'gēdo ndum-ọdu nile nime nkpuru-obim, Nēru újú n'obim n'ehihie nile? Rùe ole mb͕e ka agēbuli onye-irom elu ibu onye-isim? Legide anya, zam, Jehova, Chinekem: Nye anyam abua ìhè, ka m'we ghara iraru ura ọnwu; Ka onye-irom we ghara isi, Akariwom ya n'ike; Ka ndi-nkpab͕um we ghara iteghari egwú ọṅù mb͕e anēwezugam n'ọnọdum. Ma ọ bu ebere-Gi ka mu onwem tukwasiworo obi; Ka obim tegharia egwú ọṅù na nzọputa-Gi: Ka m'bùkue Jehova abù, N'ihi na Ọ mesowom nke-ọma.
ABÙ ỌMA 13:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m ONYENWE ANYị? Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị? Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m? Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m? Lekwasị m anya, ma zaa m, O ONYENWE ANYị Chineke m. Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ; mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ. Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ; mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị. Aga m abụku ONYENWE ANYị abụ, nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.