Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m ONYENWE ANYị? Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị? Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m? Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m? Lekwasị m anya, ma zaa m, O ONYENWE ANYị Chineke m. Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ; mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ. Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ; mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị. Aga m abụku ONYENWE ANYị abụ, nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.
Gụọ Abụ Ọma 13
Geere nke a ntị Abụ Ọma 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 13:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị