ABÙ ỌMA 124:1-8
ABÙ ỌMA 124:1-8 Bible Nso (IGBOB)
Asi na ọ bughi Jehova Nke diri ayi, Biko, ka Israel kwue otú a, si; Asi na ọ bughi jehova Nke diri ayi, Mb͕e madu biliri imegide ayi: Mb͕e ahu ha gēlowori ayi na ndu, Mb͕e iwe-ha di ọku n'aru ayi: Mb͕e ahu miri gēruchapuwori ayi, Miri-iyi gāgabigawori n'elu nkpuru-obi-ayi. Mb͕e ahu miri di nganga gāgabigawori n'elu nkpuru-obi-ayi. Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nēnyeghi ayi iburu ezé-ha anu-ndọb͕u. Nkpuru-obi-ayi ewepugawo onwe-ya dika nnunu n'ib͕udu ndi-osi-ọnyà: Ib͕udu ahu kpajiri akpaji, ayi onwe-ayi we wepuga onwe-ayi. Iye-aka-ayi di n'aha Jehova, Onye meworo elu-igwe na uwa.
ABÙ ỌMA 124:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
A sị na ONYENWE ANYị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo, a sị na ONYENWE ANYị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị, mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ; idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị, ebili mmiri niile gaara ebufu anyị. Ma otuto dịrị ONYENWE ANYị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị. Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị. Inyeaka anyị dị nʼaha ONYENWE ANYị, onye kere eluigwe na ụwa.