A sị na ONYENWE ANYị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo, a sị na ONYENWE ANYị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị, mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ; idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị, ebili mmiri niile gaara ebufu anyị. Ma otuto dịrị ONYENWE ANYị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị. Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị. Inyeaka anyị dị nʼaha ONYENWE ANYị, onye kere eluigwe na ụwa.
Gụọ Abụ Ọma 124
Geere nke a ntị Abụ Ọma 124
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 124:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo