ABÙ ỌMA 123:1-4
ABÙ ỌMA 123:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Gi ka m'gēweli anyam abua le, Gi Onye nānọdu ala n'elu-igwe. Le, dika anya ndi-orù si elekwasi aka ndi-nwe-ha, Dika anya abua nke nwayi nēje ozi si elekwasi aka nwayi nwere ike n'aru ya; Otú a ka anya-ayi nēlekwasi Jehova, bú Chineke-ayi, Rue mb͕e Ọ gēmere ayi amara. Mere ayi amara, Jehova, mere ayi amara: N'ihi na nleda ejuwo ayi afọ ri nne. Afọ ejuwo nkpuru-obi-ayi ri nne N'ichì-ọchì nke ndi nọ jū, Na nleda nke ndi-npako.
ABÙ ỌMA 123:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị, gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe. Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya, na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje, otu a ka anyị si na-elekwasị ONYENWE ANYị bụ Chineke anyị anya, ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere. Meere anyị ebere, O ONYENWE ANYị, meere anyị ebere, nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha. Nʼihi na nnagide anyị na-anagide ịchị ọchị ndị nganga, na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.