Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị, gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe. Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya, na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje, otu a ka anyị si na-elekwasị ONYENWE ANYị bụ Chineke anyị anya, ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere. Meere anyị ebere, O ONYENWE ANYị, meere anyị ebere, nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha. Nʼihi na nnagide anyị na-anagide ịchị ọchị ndị nganga, na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.
Gụọ Abụ Ọma 123
Geere nke a ntị Abụ Ọma 123
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 123:1-4
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo