ABÙ ỌMA 122:1-9
ABÙ ỌMA 122:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m, “Ka anyị gaa nʼụlọnsọ ONYENWE ANYị.” Ụkwụ anyị eguzola ugbu a nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem. E wuru Jerusalem dịka obodo a chịkọtara ọnụ nke ọma. Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo, bụ ebo niile nke ONYENWE ANYị, ịbụku aha ONYENWE ANYị abụ dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị. Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị, bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid. Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem: “Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo. Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niile nchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike.” Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m, ana m ekwu okwu sị, “Udo dịrị gị.” Nʼihi ụlọ ONYENWE ANYị, Chineke anyị, aga m achọ ọganihu gị.
ABÙ ỌMA 122:1-9 Bible Nso (IGBOB)
Aṅuririm ọṅu mb͕e ha nāsim, Ka ayi je n'ulo Jehova. Ukwu-ayi eguzowo N'ọnu-uzọ-ama-gi nile, Jerusalem; Jerusalem, nke ewuworo Dika obodo nke ejikọtara n'otù nke-ọma: Ebe ebo nile rigoworo, bú ebo nile nke Ja, Iburu Israel ihe-àmà, Ikele aha Jehova. N'ihi na n'ebe ahu ka edoworo oche-eze nile ikpe ikpe, Bú oche-eze nile ulo Devid nwere. Riọnu aririọ bayere udo Jerusalem: Ndi nāhu gi n'anya gānọ n'udo. Ka udo di n'ékpè-gi nile, Ka inọ-n'udo di kwa n'ulo-gi nile di elu. N'ihi umu-nnem na ndi-eyìm, Biko, ka m'kwue okwu, si, Ka udo di nime gi. N'ihi ulo Jehova, bú Chineke-ayi, M'gāchọrọ gi ọdi-nma.