ABÙ ỌMA 120:1-7
ABÙ ỌMA 120:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ana m akpọku ONYENWE ANYị nʼime nsogbu m, ọ na-azakwa m. O ONYENWE ANYị, zọpụta m site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha na ire na-ekwu okwu aghụghọ. Gịnị ka a ga-eme gị, ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, gị ire aghụghọ? Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ, ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere. Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek, nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda! Ogologo oge ka m binyere ndị kpọrọ udo asị. Abụ m onye udo; ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.
ABÙ ỌMA 120:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Jehova ka m'kpọkuru n'ahuhu dirim, O we zam. Jehova, naputa nkpuru-obim n'eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha, Na n'ire aghughọ. Gini ka agēnye gi, ọ̀ bu kwa gini ka agātukwasiri gi, Gi ire aghughọ? Àkú di nkọ nke dike, Ha na icheku-ọku nke osisi broom. Ahuhu dirim, na anọm dika ọbìa nime Meshek, Na ebim n'akuku ulo-ikwū nile nke Kida! Ogologo mb͕e di anya ka nkpuru-obim biriworo N'akuku onye nākpọ udo asì. Mu onwem bu onye-udo: Ma mb͕e m'nēkwu okwu, ndi ahu nāchọ ibu agha.