Ana m akpọku ONYENWE ANYị nʼime nsogbu m, ọ na-azakwa m. O ONYENWE ANYị, zọpụta m site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha na ire na-ekwu okwu aghụghọ. Gịnị ka a ga-eme gị, ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, gị ire aghụghọ? Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ, ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere. Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek, nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda! Ogologo oge ka m binyere ndị kpọrọ udo asị. Abụ m onye udo; ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.
Gụọ Abụ Ọma 120
Geere nke a ntị Abụ Ọma 120
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 120:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo