ABÙ ỌMA 119:97-112
ABÙ ỌMA 119:97-112 Bible Nso (IGBOB)
Le ka m'si hu iwu-Gi n'anya! Ogologo ubọchi nile ka nke ahu bu ihe m'natughari n'uche. Ihe nile I nyere n'iwu nēme ka m'mara ihe kari ndi-irom; N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka nke ahu dirim. Kari ndi nile nēzím ihe ka m'nwere uche; N'ihi na ihe-àmà-Gi nile bu ihe m'nātughari n'uche. Anamaghọta ihe kari ndi-okenye, N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chebeworo. Eb͕ochiwom ukwum abua ka ha ghara ibà n'uzọ ọjọ ọ bula, Ka m'we debe okwu-Gi. Esighm n'ikpé-Gi nile wezuga onwem; N'ihi na I zíwom ihe. Le ka okwu-ọnu-Gi si atọ okpo-ọnum utọ! Ha nātọ ọnum utọ kari manu-aṅu. M'nēsitei n'ihe-iriba-ama-Gi nile ghọta ihe: N'ihi nka ka m'kpọworo uzọ okwu-ugha ọ bula asì. Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum, Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm. Aṅuwom iyi, me ka o guzosie ike, Na m'gēdebe ikpé nile nke ezi omume-Gi. Ewedawom n'ala nke-uku: Me ka m'di ndu, Jehova, dika okwu-Gi si di. Biko, ka onyinye-afọ-ofufo nile nke ọnum tọ Gi utọ, Jehova, Zíkwam ikpé-Gi nile. Nkpuru-obim di n'ọbu-akam mb͕e nile; Ma echezọghm iwu-Gi. Ndi nēmebi iwu esiworom ọnya; Ma esighm nihe-iriba-ama-Gi nile fugharia. Eketawom ihe-àmà-Gi nile rue mb͕e ebighi-ebi; N'ihi na ihe nātọ obim utọ ka ha bu. Ewezugawom obim ime ukpuru-Gi nile, Rue mb͕e ebighi-ebi, rue mb͕e ikpe-azu.
ABÙ ỌMA 119:97-112 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O, otu m si hụ iwu gị nʼanya! Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile. Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m, ha na-anọnyere m oge niile. Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe, nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile. Enwere m nghọta karịa ndị okenye nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi. Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla ka m nwee ike rubere okwu gị isi Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha. Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ! A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị. Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m. Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile. Ataala m ahụhụ nke ukwuu; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka okwu gị si dị. O ONYENWE ANYị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile. Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, ma echezọghị m iwu gị. Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo. Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ. Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha.