ABÙ ỌMA 119:9-16
ABÙ ỌMA 119:9-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị. Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu. Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị. Otuto dịrị gị, o ONYENWE ANYị; kuziere m iwu gị niile. Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa iwu niile nke si nʼọnụ gị. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba. Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile. Iwu gị na-amasị m; agaghị m elefu okwu gị anya.
ABÙ ỌMA 119:9-16 Bible Nso (IGBOB)
Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha? Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di. Obim nile ka m'wereworo chọ Gi: Ekwela ka m'si n'ihe nile I nyere n'iwu jehie. N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi, Ka m'we ghara imehie megide Gi. Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova: Zím ukpuru-Gi nile. Eb͕ub͕ere-ọnum ka m'wereworo kọ akukọ Ikpé nile nke ọnu-Gi. N'uzọ ihe-àmà-Gi nile ka obi nātọm utọ, Dika ọ gātọm utọ bayere àkù nile. N'ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'gātughari uche, M'gēlegide kwa uzọ-Gi nile anya. Ihe ukpuru-Gi nile gātọm utọ nke-uku: M'gaghi-echezọ okwu-Gi.