ABÙ ỌMA 119:81-83
ABÙ ỌMA 119:81-83 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị. Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?” Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 119ABÙ ỌMA 119:81-83 Bible Nso (IGBOB)
Nkpuru-obim agwusiwo site n'ichọsi nzọputa-Gi ike: Ma okwu-Gi ka m'chereworo. Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike, Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi? N'ihi na adiwom ka karama-akpukpọ di n'anwuru-ọku; Ma echezọghm ukpuru-Gi nile.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 119