Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 119:65-96

ABÙ ỌMA 119:65-96 Bible Nso (IGBOB)

I meworo orù-Gi ezi ihe, Jehova, dika okwu-Gi si di. Zím idi-nma nke ezi uche na ihe-ọmuma; N'ihi na ọ bu n'ihe nile I nyere n'iwu ka m'kwereworo. Tutu ewedam n'ala mu onwem nēme ihe ọjọ n'amaghi-ama; Ma ub͕u a okwu-ọnu-Gi ka m'debeworo. Onye di nma ka I bu, na Onye nēme nma; Zím ukpuru-Gi nile. Ndi-nganga etekpuwom okwu-ugha dika ihe-ntekpu: Mu onwem gēwere obim nile chebe ihe-iriba-ama-Gi nile. Obi-ha bu nání abuba dika abuba; Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku. Ọ dim nma na ewedawom n'ala; Ka m'we muta ukpuru-Gi nile. Iwu ọnu-Gi dim nma Kari ọla-edo na ọla-ọcha nādighi iguta-ọnu. Aka-Gi abua emewom, me kwa ka m'guzosie ike: Gi me ka m'ghọta ihe, ka m'we muta ihe nile I nyere n'iwu. Ndi nātu egwu Gi gāhum, we ṅuria; N'ihi na okwu-Gi ka m'chereworo. Jehova, amawom na ikpé-Gi nile bu ezi omume, Amawokwam na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka I wedaworom nala. Biko, kwe ka ebere-Gi buru ihe gākasi obim, Dika okwu-ọnu-Gi nke diri orù-Gi si di. Ka obi-ebere-Gi nile biakutem, ka m'we di ndu; N'ihi na iwu-Gi bu ihe nātọm utọ nke-uku. Ka ihere me ndi-nganga; n'ihi na ha ewerewo okwu-ugha me ka ikpém b͕agọ ab͕agọ: Ma m'gātughari uche n'ihe-iriba-ama-Gi nile. Ka ndi nātu egwu Gi laghachikutem, Ha gāma kwa ihe-àmà-Gi nile. Ka obim zue okè n'ukpuru-Gi nile, Ka ihere we ghara imem. Nkpuru-obim agwusiwo site n'ichọsi nzọputa-Gi ike: Ma okwu-Gi ka m'chereworo. Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike, Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi? N'ihi na adiwom ka karama-akpukpọ di n'anwuru-ọku; Ma echezọghm ukpuru-Gi nile. Ùbọchi nke orù-Gi di ole? Òle mb͕e I gēme ndi nēsob͕um ihe I kpere n'ikpe? Ndi-nganga egwuworom olùlù di iche iche, Bú ndi nādighi ka iwu-Gi si di. Ihe nile I nyere n'iwu kwesiri ntukwasi-obi: N'uzọ okwu-ugha ka ha nēsob͕um; biko, yerem aka. Ọ fọduru nwantī ka ha me ka m'gwusia n'uwa; Ma mu onwem arapughi ihe-iriba-ama-Gi nile. Dika ebere-Gi si di, me ka m'di ndu, M'gēdebe kwa ihe-àmà nke ọnu-Gi. Jehova, rue mb͕e ebighi-ebi Ka emeworo ka okwu-Gi guzosie ike n'elu-igwe. Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di: I mewo ka uwa guzosie ike, o we guzo. Dika ikpé-Gi nile si di, ha nēguzo ta; N'ihi na ihe nile bu ndi-orù-Gi. Asi na iwu-Gi abughi ihe nātọm utọ nke-uku, Mb͕e ahu m'gālawori n'iyì nime nweda-n'alam. Rue mb͕e ebighi-ebi m'gaghi-echezọ ihe-iriba-ama-Gi nile: N'ihi na ha ka I jiworo me ka m'di ndu. Ọ bu Gi nwem, zọputam; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo. Ndi nēmebi iwu elewo anyam ime ka m'la n'iyì; Ma ihe-àmà-Gi nile ka m'gātukwasi uche. Ahuwom nsọtu diri izu-okè nile; Ma ihe, I nyere n'iwu sara mbara nke-uku.

ABÙ ỌMA 119:65-96 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Meere ohu gị ihe ọma dịka okwu gị si dị, o ONYENWE ANYị. Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile. Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m, ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi. I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi; kuziere m iwu gị niile. Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m, ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị. Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha, ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị. Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile. Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo. Aka gị kere m, kpụọkwa m; nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile. Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị. O ONYENWE ANYị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ. Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, dịka nkwa i kwere ohu gị si dị. Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, nʼihi na iwu gị na-amasị m. Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m, ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile. Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m. Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị. Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?” Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile. Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ? Ndị mpako na-egwuru m olulu, bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị. Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi; nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha. Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi, ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ. Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m, ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị. O ONYENWE ANYị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe. Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike. Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi. A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m, agaara m anwụ nʼime nsogbu m. Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m. Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi, ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke, ma iwu gị niile enweghị nsọtụ.