ABÙ ỌMA 119:65-80
ABÙ ỌMA 119:65-80 Bible Nso (IGBOB)
I meworo orù-Gi ezi ihe, Jehova, dika okwu-Gi si di. Zím idi-nma nke ezi uche na ihe-ọmuma; N'ihi na ọ bu n'ihe nile I nyere n'iwu ka m'kwereworo. Tutu ewedam n'ala mu onwem nēme ihe ọjọ n'amaghi-ama; Ma ub͕u a okwu-ọnu-Gi ka m'debeworo. Onye di nma ka I bu, na Onye nēme nma; Zím ukpuru-Gi nile. Ndi-nganga etekpuwom okwu-ugha dika ihe-ntekpu: Mu onwem gēwere obim nile chebe ihe-iriba-ama-Gi nile. Obi-ha bu nání abuba dika abuba; Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku. Ọ dim nma na ewedawom n'ala; Ka m'we muta ukpuru-Gi nile. Iwu ọnu-Gi dim nma Kari ọla-edo na ọla-ọcha nādighi iguta-ọnu. Aka-Gi abua emewom, me kwa ka m'guzosie ike: Gi me ka m'ghọta ihe, ka m'we muta ihe nile I nyere n'iwu. Ndi nātu egwu Gi gāhum, we ṅuria; N'ihi na okwu-Gi ka m'chereworo. Jehova, amawom na ikpé-Gi nile bu ezi omume, Amawokwam na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka I wedaworom nala. Biko, kwe ka ebere-Gi buru ihe gākasi obim, Dika okwu-ọnu-Gi nke diri orù-Gi si di. Ka obi-ebere-Gi nile biakutem, ka m'we di ndu; N'ihi na iwu-Gi bu ihe nātọm utọ nke-uku. Ka ihere me ndi-nganga; n'ihi na ha ewerewo okwu-ugha me ka ikpém b͕agọ ab͕agọ: Ma m'gātughari uche n'ihe-iriba-ama-Gi nile. Ka ndi nātu egwu Gi laghachikutem, Ha gāma kwa ihe-àmà-Gi nile. Ka obim zue okè n'ukpuru-Gi nile, Ka ihere we ghara imem.
ABÙ ỌMA 119:65-80 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Meere ohu gị ihe ọma dịka okwu gị si dị, o ONYENWE ANYị. Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile. Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m, ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi. I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi; kuziere m iwu gị niile. Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m, ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị. Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha, ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị. Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile. Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo. Aka gị kere m, kpụọkwa m; nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile. Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị. O ONYENWE ANYị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ. Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, dịka nkwa i kwere ohu gị si dị. Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, nʼihi na iwu gị na-amasị m. Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m, ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile. Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m.