ABÙ ỌMA 119:49-56
ABÙ ỌMA 119:49-56 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Cheta okwu i nyere ohu gị, nʼihi na i nyela m olileanya. Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a: nkwa gị na-echebe ndụ m. Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka, ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m. O ONYENWE ANYị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie, ha na-ewetara m nkasiobi. Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume, ndị gbakụtara iwu gị azụ. Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m ebe ọbụla m na-anọ. Nʼabalị, o ONYENWE ANYị, ana m echeta aha gị, aga m edebekwa iwu gị. Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile: ana m erubere ụkpụrụ gị isi.
ABÙ ỌMA 119:49-56 Bible Nso (IGBOB)
Cheta okwu I gwara orù-Gi, Nke I meworom ka m'chere. Nka bu nkasi-obim nime nweda-n'alam: Na okwu-ọnu-Gi emewo ka m'di ndu. Ndi-nganga akwawom emò nke-uku: Ma esighm n'iwu-Gi wezuga onwem. Echetawom ikpé-Gi nile site na mb͕e ebighi-ebi, jehova, We kasie onwem obi. Iwe di ọku ejidewom, N'ihi ndi nēmebi iwu ndi nārapu iwu-Gi. Abù ọma ka ukpuru-Gi nile buruworom N'ulo ebe m'nọ dika ọbìa. Echetawom aha-Gi, Jehova, n'abali, We debe iwu-Gi. Nka ka m'nweworo, Na echebewom ihe-iriba-ama-Gi nile.