Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 119:33-64

ABÙ ỌMA 119:33-64 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

O ONYENWE ANYị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ. Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi. Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ. Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe. Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị. Mezuo nkwa i kwere ohu gị, ka a tụọ egwu gị. Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! Chebe ndụ m site nʼezi omume gị. O ONYENWE ANYị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị; mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị. Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile. Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi. Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze ma ihere agaghị eme m, nʼihi na iwu gị na-amasị m nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya. Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile. Cheta okwu i nyere ohu gị, nʼihi na i nyela m olileanya. Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a: nkwa gị na-echebe ndụ m. Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka, ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m. O ONYENWE ANYị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie, ha na-ewetara m nkasiobi. Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume, ndị gbakụtara iwu gị azụ. Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m ebe ọbụla m na-anọ. Nʼabalị, o ONYENWE ANYị, ana m echeta aha gị, aga m edebekwa iwu gị. Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile: ana m erubere ụkpụrụ gị isi. O ONYENWE ANYị, ị bụ ihe nketa m; ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile. Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị; meere m ebere dịka nkwa gị si dị. Echeela m echiche banyere ụzọ m niile, chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile. Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge irubere iwu gị niile isi. A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ, agaghị m echefu iwu gị. Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele nʼihi iwu gị niile ziri ezi. Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị, ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị. O ONYENWE ANYị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị; kuziere m iwu gị niile.

ABÙ ỌMA 119:33-64 Bible Nso (IGBOB)

Jehova, zím uzọ ukpuru-Gi nile: M'gēchebe kwa ya rue mb͕e ikpe-azu. Me ka m'ghọta ihe, m'gēchebe kwa iwu-Gi; M'gēwere kwa obim nile debe ya. Me ka m'zọ ije n'okporo-uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu; N'ihi na uzọ ahu nātọm utọ Wezuga obim iche ihe-àmà-Gi nile iru, Ewezuga-kwa-la ya iche urù nēzighi ezi iru. Me ka anyam abua si n'ile ihe-efu gabiga, Me ka m'di ndu n'uzọ-Gi nile. Me ka okwu-ọnu-Gi guzosiere orù-Gi ike, Bú nke diri egwu-Gi. Me ka ita-utam nke m'nātu ujọ ya gabiga; N'ihi na ikpé-Gi nile di nma. Le, achọsiwom ihe-iriba-ama-Gi nile ike: N'ezi omume-Gi me ka m'di ndu. Ọzọ, kwe ka ebere-Gi nile biakutem, Jehova, Bú nzọputa-Gi, dika okwu-ọnu-Gi si di. M'gāza kwa onye nātam uta okwu; N'ihi na atukwasiwom okwu-Gi obi. Anapusi-kwa-la okwu nke ezi-okwu n'ọnum; N'ihi na ikpé-Gi nile ka m'chereworo. M'gēdebe kwa iwu-Gi mb͕e nile Rue mb͕e nile ebighi-ebi. M'gējeghari kwa n'ebe sara mbara; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo. M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze, Ihere agaghi-emekwam. Ihe nke ihe nile I nyere n'iwu gātọkwam utọ nke-uku, Bú nke m'huworo n'anya. M'gāchili-kwa-ra ihe nile I nyere n'iwu ọbu-akam, bú ihe nke m'huworo n'anya; M'gātughari kwa uche n'ukpuru-Gi nile. Cheta okwu I gwara orù-Gi, Nke I meworom ka m'chere. Nka bu nkasi-obim nime nweda-n'alam: Na okwu-ọnu-Gi emewo ka m'di ndu. Ndi-nganga akwawom emò nke-uku: Ma esighm n'iwu-Gi wezuga onwem. Echetawom ikpé-Gi nile site na mb͕e ebighi-ebi, jehova, We kasie onwem obi. Iwe di ọku ejidewom, N'ihi ndi nēmebi iwu ndi nārapu iwu-Gi. Abù ọma ka ukpuru-Gi nile buruworom N'ulo ebe m'nọ dika ọbìa. Echetawom aha-Gi, Jehova, n'abali, We debe iwu-Gi. Nka ka m'nweworo, Na echebewom ihe-iriba-ama-Gi nile. Òkèm ka Jehova bu: Asiwom na m'gēdebe okwu-Gi nile. Ewerewom obim nile me ka iru-Gi dajua: Merem amara dika okwu-ọnu-Gi si di. Echèrem èchìchè uzọm nile, We me ka ukwum abua laghachi n'ihe-àmà-Gi nile. Abiaram ọsọsọ, ọ b͕agwojughkwam anya, Idebe ihe nile I nyere n'iwu. Udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu ehikọwom buruburu; Ma echezọghm iwu-Gi. N'etiti abali ka m'gēbili ikele Gi N'ihi ikpé nile nke ezi omume-gi. Onye ekekọtaworo mu na ndi nile nātu egwu Gi n'otù ka m'bu, Onye ekekọtaworo mu na ndi nēdebe ihe-iriba-ama-Gi nile n'otù. Jehova, uwa juputara n'ebere-Gi: Zím ukpuru-Gi nile.