Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 119:33-48

ABÙ ỌMA 119:33-48 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

O ONYENWE ANYị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ. Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi. Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ. Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe. Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị. Mezuo nkwa i kwere ohu gị, ka a tụọ egwu gị. Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! Chebe ndụ m site nʼezi omume gị. O ONYENWE ANYị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị; mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị. Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile. Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi. Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze ma ihere agaghị eme m, nʼihi na iwu gị na-amasị m nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya. Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile.