ABÙ ỌMA 119:33-35
ABÙ ỌMA 119:33-35 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ. Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi. Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 119