ABÙ ỌMA 119:32-45
ABÙ ỌMA 119:32-45 Bible Nso (IGBOB)
N'uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu ka m'gāb͕a ọsọ, N'ihi na I gēme ka obim sa mbara. Jehova, zím uzọ ukpuru-Gi nile: M'gēchebe kwa ya rue mb͕e ikpe-azu. Me ka m'ghọta ihe, m'gēchebe kwa iwu-Gi; M'gēwere kwa obim nile debe ya. Me ka m'zọ ije n'okporo-uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu; N'ihi na uzọ ahu nātọm utọ Wezuga obim iche ihe-àmà-Gi nile iru, Ewezuga-kwa-la ya iche urù nēzighi ezi iru. Me ka anyam abua si n'ile ihe-efu gabiga, Me ka m'di ndu n'uzọ-Gi nile. Me ka okwu-ọnu-Gi guzosiere orù-Gi ike, Bú nke diri egwu-Gi. Me ka ita-utam nke m'nātu ujọ ya gabiga; N'ihi na ikpé-Gi nile di nma. Le, achọsiwom ihe-iriba-ama-Gi nile ike: N'ezi omume-Gi me ka m'di ndu. Ọzọ, kwe ka ebere-Gi nile biakutem, Jehova, Bú nzọputa-Gi, dika okwu-ọnu-Gi si di. M'gāza kwa onye nātam uta okwu; N'ihi na atukwasiwom okwu-Gi obi. Anapusi-kwa-la okwu nke ezi-okwu n'ọnum; N'ihi na ikpé-Gi nile ka m'chereworo. M'gēdebe kwa iwu-Gi mb͕e nile Rue mb͕e nile ebighi-ebi. M'gējeghari kwa n'ebe sara mbara; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo.
ABÙ ỌMA 119:32-45 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Aga m agbaso iwu gị niile nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya. O ONYENWE ANYị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ. Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi. Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ. Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe. Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị. Mezuo nkwa i kwere ohu gị, ka a tụọ egwu gị. Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! Chebe ndụ m site nʼezi omume gị. O ONYENWE ANYị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị; mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị. Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile. Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi. Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.