ABÙ ỌMA 119:17-32
ABÙ ỌMA 119:17-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ; aga m erubere okwu gị isi. Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị. Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa; ezonarịla m iwu gị niile. Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile na-agụ mkpụrụobi m agụụ. Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ na ndị na-anaghị agbaso iwu gị. Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị, nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile. Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m, ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị. Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m. Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu; kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị. Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m; ugbu a, kuziere m iwu gị. Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile. Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; gbaa m ume dịka okwu gị si dị. Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile; site nʼiwu gị meere m amara. Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi; e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile. O ONYENWE ANYị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike; ekwela ka ihere mee m. Aga m agbaso iwu gị niile nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya.
ABÙ ỌMA 119:17-32 Bible Nso (IGBOB)
Meso orù-Gi nke-ọma, ka m'we di ndu; M'gēdebe kwa okwu-Gi. Kpughepu anyam abua, ka m'we legide Oké ihe di iche iche si n'iwu-Gi puta. Ọbìa ka m'bu n'uwa: Ezonarilam ihe nile I nyere n'iwu. Nkpuru-obim etiwawo n'ihi ọchichọ O ji chọsie ikpé-Gi nile ike mb͕e nile. I basiworo ndi-nganga ndi abuworo ọnu nba ike, Ndi nēsi n'ihe nile I nyere n'iwu jehie. Wepu ita-uta na nleda n'arum; N'ihi na echebewom ihe-àmà-Gi nile. Ọzọ, ndi-isi nọduru ala kwurita okwu imegidem: Ma orù-Gi nātughari uche n'ukpuru-Gi nile. Ọzọ, ihe-àmà-Gi nile bu ihe nātọm utọ nke-uku, Ha bu ndi nādum ọdu. Nkpuru-obim nārapara n'ájá: Dika okwu-Gi si di, me ka m'di ndu. Akọrọm akukọ uzọm nile, I we zam: Gi zím ukpuru-Gi nile. Me ka m'ghọta uzọ nke ihe-iriba-ama-Gi nile: M'gātughari kwa uche n'oké ọlu-Gi nile. Nkpuru-obim atupuwo dika miri site n'iru-újú: Dika okwu-Gi si di, me ka m'guzosie ike. Wezuga uzọ okwu-ugha n'ebe m'nọ: Were kwa amara nyem iwu-Gi. Uzọ nke ikwesi-ntukwasi-obi ka m'rọputaworo: Ikpé-Gi nile ka m'doworo n'irum. Araparawom n'aru ihe-àmà-Gi nile: Jehova, emela ka ihere mem. N'uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu ka m'gāb͕a ọsọ, N'ihi na I gēme ka obim sa mbara.