ABÙ ỌMA 119:145-160
ABÙ ỌMA 119:145-160 Bible Nso (IGBOB)
Ewerewom obim nile kpọ nkpu; zam, Jehova: Ukpuru-Gi nile ka m'gēchebe. Akpọkuwom I; zọputam, M'gēdebe kwa ihe-àmà-Gi nile. Eburum chi-ọbubọ uzọ, we tikue Gi: Okwu-Gi nile ka m'chere. Anyam abua buru nche-abali nile uzọ, Ka m'we tugharia uche n'okwu-ọnu-Gi. Nuru olum, dika ebere-Gi si di: Dika ikpé-Gi nile si di, Jehova, me ka m'di ndu. Ha abiaruwo nso bú ndi nāb͕aso nzube ọjọ; Ha nọ iwu-Gi n'ebe di anya. Gi onwe-gi nọ nso, Jehova; Ọzọ, ihe nile I nyere n'iwu bu ezi-okwu. Site na mb͕e ochie ka m'maworo site n'ihe-àmà-Gi nile, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka I tọworo ntọ-ala-ha. Hu nweda-n'alam, dọputam; N'ihi na echezọghm iwu-Gi. Kpe ọnum b͕aputakwam: Dika okwu-ọnu-Gi si di, me ka m'di ndu. Nzọputa di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ; N'ihi na ha achọghi ukpuru-Gi nile. Obi-ebere-Gi nile bara uba, Jehova; Dika ikpé-Gi nile si di, me ka m'di ndu. Ha di ọtutu, bú ndi nēsob͕um na ndi nākpab͕um; Ma esighm n'ihe-àmà-Gi nile wezuga onwem. Ahurum ndi nāghọb͕u nghọb͕u, m'we sọ ha oyi; N'ihi na ha edebeghi okwu-ọnu-Gi. Le otú m'huworo ihe-iriba-ama-Gi nile n'anya: Dika ebere-Gi si di, Jehova, me ka m'di ndu. Isi ihe nke okwu-Gi bu ezi-okwu; Ọzọ, rue mb͕e ebighi-ebi ka ikpé ọ bula nke ezi omume-Gi di.
ABÙ ỌMA 119:145-160 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o ONYENWE ANYị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile. Ana m akpọku gị; zọpụta m aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile. Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka; olileanya m dị nʼokwu gị. Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile. Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka iwu gị niile si dị. Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya. Ma ị nọ nso, ONYENWE ANYị; ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu. Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m, nʼihi na echefughị m iwu gị. Kpepụta m, gbapụta m, chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị. Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile. O ONYENWE ANYị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị. Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, ma aga m anọgide na-edebe iwu gị. Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi. Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka ịhụnanya gị si dị. Okwu gị niile bụ eziokwu; iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.