Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 119:113-176

ABÙ ỌMA 119:113-176 Bible Nso (IGBOB)

Ndi nwere uche abua ka m'kpọworo asì: Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya. Ebe-nzuzom na ọtam ka I bu: Okwu-Gi ka m'chereworo. Sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu ndi nēme ihe ọjọ; Ka m'we chebe ihe nile Chinekem nyere n'iwu. Kwagidem dika okwu-ọnu-Gi si di, ka m'we di ndu; Eme-kwa-la ka ihere olile-anyam mem. Kwaliem elu, ewe zọputam, M'gēle kwa ukpuru-Gi nile anya ọma mb͕e nile. I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya, N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu. I nēme ka ndi nile nēmebi iwu n'uwa gwusia di ka ifuru: N'ihi ya ka m'huworo ihe-àmà-Gi nile n'anya. Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi; Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha. Emewom ikpe ekpere na ezi omume: Arapulam nye ndi nēmeb͕um. Buru onye-mbe nye orù-Gi na I gēmem nma: Ekwela ka ndi-nganga meb͕uem. Anyam abua adalawo n'isi n'ichọsi nzọputa-Gi ike, Na n'ichọsi okwu ezi omume-Gi ike. Meso orù-Gi dika ebere-Gi si di, Zíkwam ukpuru-Gi nile Orù-Gi ka m'bu, me ka m'ghọta ihe, Ka m'we mara ihe-àmà-Gi nile. Mb͕e eruworo Jehova ilu ọlu; Ha emebiwo iwu-Gi. N'ihi nka ka m'huworo ihe nile I nyere n'iwu n'anya Kari ọla-edo, e, kari ọla-edo anuchara anucha. N'ihi nka ka m'guworo ihe-iriba-ama-Gi nile, nke diri ihe nile, n'ihe ziri ezi; Uzọ okwu-ugha ọ bula ka m'kpọworo asì. Oké ọlu ka ihe-àmà-Gi nile bu: N'ihi nka ka nkpuru-obim chebeworo ha. Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè; Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe. Asaghepurum ọnum, ku kwa ume ike ike; N'ihi na achọsirim ihe nile I nyere n'iwu ike. Chem iru, me-kwa-ram amara, Dika I si eme ndi nāhu aha-Gi n'anya. Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi: Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim. B͕aputam na nmeb͕u nke madu: M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile. Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè; Zíkwam ukpuru-Gi nile. Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua, N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi. Onye ezi omume ka I bu Jehova, Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu. I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omume Na ikwesi-ntukwasi-obi di uku. Ekworom ekpochapuwom, N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile. Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu; Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya. Onye ntà ka m'bu, na onye anēleda anya: Ma echezọghm ihe-iriba-ama-Gi nile. Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mb͕e ebighi-ebi, Iwu-Gi bu kwa ezi-okwu Ahuhu na nkpà achọtawom: Ma ihe nile I nyere n'iwu bu ihe nātọm utọ nke-uku. Ihe-àmà-Gi nile bu ezi omume rue mb͕e ebighi-ebi: Me ka m'ghọta ihe, m'gādi kwa ndu. Ewerewom obim nile kpọ nkpu; zam, Jehova: Ukpuru-Gi nile ka m'gēchebe. Akpọkuwom I; zọputam, M'gēdebe kwa ihe-àmà-Gi nile. Eburum chi-ọbubọ uzọ, we tikue Gi: Okwu-Gi nile ka m'chere. Anyam abua buru nche-abali nile uzọ, Ka m'we tugharia uche n'okwu-ọnu-Gi. Nuru olum, dika ebere-Gi si di: Dika ikpé-Gi nile si di, Jehova, me ka m'di ndu. Ha abiaruwo nso bú ndi nāb͕aso nzube ọjọ; Ha nọ iwu-Gi n'ebe di anya. Gi onwe-gi nọ nso, Jehova; Ọzọ, ihe nile I nyere n'iwu bu ezi-okwu. Site na mb͕e ochie ka m'maworo site n'ihe-àmà-Gi nile, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka I tọworo ntọ-ala-ha. Hu nweda-n'alam, dọputam; N'ihi na echezọghm iwu-Gi. Kpe ọnum b͕aputakwam: Dika okwu-ọnu-Gi si di, me ka m'di ndu. Nzọputa di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ; N'ihi na ha achọghi ukpuru-Gi nile. Obi-ebere-Gi nile bara uba, Jehova; Dika ikpé-Gi nile si di, me ka m'di ndu. Ha di ọtutu, bú ndi nēsob͕um na ndi nākpab͕um; Ma esighm n'ihe-àmà-Gi nile wezuga onwem. Ahurum ndi nāghọb͕u nghọb͕u, m'we sọ ha oyi; N'ihi na ha edebeghi okwu-ọnu-Gi. Le otú m'huworo ihe-iriba-ama-Gi nile n'anya: Dika ebere-Gi si di, Jehova, me ka m'di ndu. Isi ihe nke okwu-Gi bu ezi-okwu; Ọzọ, rue mb͕e ebighi-ebi ka ikpé ọ bula nke ezi omume-Gi di. Ndi-isi esob͕uwom n'efu; Ma okwu-Gi nile ka obim tuworo oké egwu ha. Obi nātọ mu onwem utọ n'ihi okwu-ọnu-Gi, Dika onye nāhuta ọtutu ihe-nkwata. Okwu-ugha ka m'kpọworo asì, m'we kpọ ya ihe-árú; Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya. Ub͕ò asa n'ubọchi ka m'toworo Gi, N'ihi ikpé nile nke ezi omume-Gi. Udo nke riri nne ka ndi nāhu iwu-Gi n'anya nwere; Ọ dighi kwa ihe-isu-ngọngọ ha nwere. Elewom anya nzọputa-Gi, Jehova, Ọ bu kwa ihe nile I nyere n'iwu ka m'meworo. Nkpuru-obim edebewo ihe-àmà-Gi nile; Anamahu kwa ha n'anya nke-uku. Edebewom ihe-iriba-ama-Gi nile na ihe-àmà-Gi nile; N'ihi na uzọm nile di n'iru Gi. Ka iti-nkpum biarue nso n'iru Gi, Jehova: Dika okwu-Gi si di, me ka m'ghọta ihe. Ka aririọ-amaram bia n'iru Gi: Dika okwu-ọnu-Gi si di, naputam. Ka eb͕ub͕ere-ọnum kwuwa otuto; N'ihi na I nezím ukpuru-Gi nile. Ka irem bùa abù bayere okwu-ọnu-Gi; N'ihi na ihe nile I nyere n'iwu bu ezi omume. Ka aka-Gi buru ihe iyerem aka; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'rọputaworo. Achọsiwom nzọputa-Gi ike, Jehova; Iwu-Gi bu kwa ihe nātọm utọ nke-uku. Ka nkpuru-obim di ndu, ọ gēto kwa Gi; Ka ikpé-Gi nile ye-kwa-ram aka. Efughariwom dika aturu nke furu efu; chọ orù-Gi; N'ihi na echezọghm ihe nile I nyere n'iwu.

ABÙ ỌMA 119:113-176 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị. Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ, ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m! Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ; ekwekwala ka olileanya m daa. Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara; aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile. Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị, nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi. Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu; nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya. Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile. Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi; ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m. Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya; ekwela ka ndị mpako kpagbuo m. Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi. Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile. Abụ m ohu gị, nye m nghọta, ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile. O ONYENWE ANYị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ, nʼihi na a na-emebi iwu gị. Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha, nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi, akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị. Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi. Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe. Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike. Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere. Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m. Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị. Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile. Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị. O ONYENWE ANYị, ị bụ onye ezi omume, iwu gị niile zikwara ezi. Ụkpụrụ gị niile ziri ezi; ha kwesiri ntụkwasị obi. Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya, ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba. Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma, ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya. Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya, ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya. Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Iwu gị niile bụkwa eziokwu. Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m. Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ. Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o ONYENWE ANYị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile. Ana m akpọku gị; zọpụta m aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile. Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka; olileanya m dị nʼokwu gị. Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile. Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka iwu gị niile si dị. Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya. Ma ị nọ nso, ONYENWE ANYị; ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu. Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m, nʼihi na echefughị m iwu gị. Kpepụta m, gbapụta m, chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị. Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile. O ONYENWE ANYị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị. Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, ma aga m anọgide na-edebe iwu gị. Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi. Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka ịhụnanya gị si dị. Okwu gị niile bụ eziokwu; iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere, ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị, nʼihi iwu gị ziri ezi. Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ. Ana m echere nzọpụta gị, o ONYENWE ANYị, na-agbasokwa iwu gị niile. Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu. Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi, nʼihi na ị maara ụzọ m niile. Ka akwa m ruo gị ntị, o ONYENWE ANYị; nye m nghọta dịka okwu gị si dị. Ka arịrịọ m ruo gị ntị; gbapụta m dịka nkwa gị si dị. Ka ọnụ m jupụta nʼotuto, nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile. Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. Nọọ na njikere oge niile inyere m aka, nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile. Ana m ele anya nzọpụta gị, o ONYENWE ANYị, iwu gị bụ ihe na-amasị m. Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị, ka iwu gị niile gbaa m ume. Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu, chọọ ohu gị, nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.