ABÙ ỌMA 118:1-14
ABÙ ỌMA 118:1-14 Bible Nso (IGBOB)
Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Biko, ka Israel si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Biko, ka ulo Eron si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Biko, ka ndi nātu egwu Jehova si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. M'siri na nkpàm kpọkue Ja; Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara. Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu: Gini ka madu gēmem? Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka: Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì. Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi madu obi. Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi ndi amara aha-ha obi. Mba nile ab͕awom buruburu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha. Ha ab͕awom buruburu; e, ha ab͕awom buruburu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha. Ha ab͕awom buruburu dika aṅu; emenyuwo ha dika ọku ogwu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha. I nudawom enuda ka m'we da: Ma Jehova yerem aka. Ikem na abù ọmam ka Ja bu: Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa.
ABÙ ỌMA 118:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Keleenụ ONYENWE ANYị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ka ndị niile na-atụ egwu ONYENWE ANYị kwuo sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m ONYENWE ANYị, ọ zara m, mee ka m nwere onwe m. ONYENWE ANYị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m? ONYENWE ANYị nọnyere m; ọ bụ onye na-enyere m aka. Aga m ele ndị iro m anya na mmeri. Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime ONYENWE ANYị karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi. Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime ONYENWE ANYị karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi. Mba niile gbara m gburugburu ma site nʼaha ONYENWE ANYị aga m ala ha nʼiyi. Ha gbara m gburugburu, ma site nʼaha ONYENWE ANYị ka m na-egbuda ha. Ha gbara m gburugburu dịka aṅụ, ma e menyụọla ha dịka ogwu na-ere ọkụ; site nʼaha ONYENWE ANYị, ka m na-egbuda ha. Akwaghachiri m azụ, agaara m ada, ma ONYENWE ANYị nyere m aka. ONYENWE ANYị bụ ike m na abụ m; ọ ghọọla nzọpụta m.