Keleenụ ONYENWE ANYị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ka ndị niile na-atụ egwu ONYENWE ANYị kwuo sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m ONYENWE ANYị, ọ zara m, mee ka m nwere onwe m. ONYENWE ANYị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m? ONYENWE ANYị nọnyere m; ọ bụ onye na-enyere m aka. Aga m ele ndị iro m anya na mmeri. Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime ONYENWE ANYị karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi. Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime ONYENWE ANYị karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi. Mba niile gbara m gburugburu ma site nʼaha ONYENWE ANYị aga m ala ha nʼiyi. Ha gbara m gburugburu, ma site nʼaha ONYENWE ANYị ka m na-egbuda ha. Ha gbara m gburugburu dịka aṅụ, ma e menyụọla ha dịka ogwu na-ere ọkụ; site nʼaha ONYENWE ANYị, ka m na-egbuda ha. Akwaghachiri m azụ, agaara m ada, ma ONYENWE ANYị nyere m aka. ONYENWE ANYị bụ ike m na abụ m; ọ ghọọla nzọpụta m.
Gụọ Abụ Ọma 118
Geere nke a ntị Abụ Ọma 118
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 118:1-14
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo