ABÙ ỌMA 115:1-8
ABÙ ỌMA 115:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o ONYENWE ANYị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị, nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị. Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?” Chineke anyị bi nʼeluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme. Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha, ha bụ ọrụ aka mmadụ. Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya abụọ ma ha adịghị ahụ ụzọ; ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ha nwekwara imi ma ha adịghị anụ isisi ọbụla; ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka, ha nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije; ha enweghị ike iji akpịrị ha mee mkpọtụ ọbụla. Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha. Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha.
ABÙ ỌMA 115:1-8 Bible Nso (IGBOB)
Ọ bughi ayi, Jehova, ọ bughi ayi, Kama ọ bu aha-Gi ka I gēnye nsọpuru, N'ihi ebere-Gi, na n'ihi ezi-okwu-Gi. N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Biko, òle ebe Chineke-ha nọ? Ma Chineke-ayi nọ n'elu-igwe: Ihe nile nke tọrọ Ya utọ ka O meworo. Arusi nile ha bu ọla-ọcha na ọla-edo, Ọlu aka madu. Ha nwere ọnu, ma ha adighi-ekwu okwu; Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ; Ha nwere nti abua, ma ha adighi-anu ihe; Ha nwere imi, ma ha adighi-anuta ísì; Ha nwere aka-ha abua, ma ha adighi-ebitu ihe; Ha nwere ukwu-ha abua, ma ha adighi-eje ije; Ha adighi-ewere akpiri-ha me uṅara. Ndi nēme ha gādi ka ha: E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.