Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o ONYENWE ANYị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị, nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị. Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?” Chineke anyị bi nʼeluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme. Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha, ha bụ ọrụ aka mmadụ. Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya abụọ ma ha adịghị ahụ ụzọ; ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ha nwekwara imi ma ha adịghị anụ isisi ọbụla; ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka, ha nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije; ha enweghị ike iji akpịrị ha mee mkpọtụ ọbụla. Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha. Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha.
Gụọ Abụ Ọma 115
Geere nke a ntị Abụ Ọma 115
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 115:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị