ABÙ ỌMA 114:1-8
ABÙ ỌMA 114:1-8 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e Israel siri n'Ijipt puta, Mb͕e ulo Jekob siri na ndi nātatọ okwu puta; Juda ghọro ebe nsọ Ya, Israel ghọrọ ala Ọ nāchi. Oké osimiri huru ya, we b͕alaga; Jọdan chighariri la azu. Ugwu nile wuliri elu dika ebulu, Ugwu ntà nile wuliri elu dika umu-aturu. Gini nēme gi, oké osimiri, na i nāb͕a ọsọ? Gini nēme gi, Jọdan, na i nēchighari la azu? Gini nēme unu, ugwu, na unu nāwuli elu dika ebulu? Gini nēme unu, ugwu ntà, na unu nāwuli elu dika umu-aturu? Ka o b͕ue gi nb͕u, gi uwa, site n'iru Onye-nwe-ayi, Site n'iru Chineke nke Jekob; Onye b͕anwere oké nkume ka ọ ghọ ọdọ-miri juputara na miri, B͕anwe ọmú ka ọ ghọ isi-iyi miri.
ABÙ ỌMA 114:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta, Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke, Izrel ghọrọ ala ọ na-achị. Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ, osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ; Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule; ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ. Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ? Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ? Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule? Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ? Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb, onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri, onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri.