Abụ Ọma 114
114
Abụ Ọma 114
Abụ ncheta ngabiga
1Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta,
mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta,
2Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke,
Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.
3Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ,#114:3 Ọpụ 14:21
osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ#114:3 Jos 3:12-16;
4Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule;
ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ.
5Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ?
Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ?
6Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule?
Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?
7Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị,
ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb,
8onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri,
onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri.#114:8 Aịz 48:21; 1Kọ 10:4
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
Abụ Ọma 114: BIU
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.