ABÙ ỌMA 105:1-15
ABÙ ỌMA 105:1-15 Bible Nso (IGBOB)
Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya; Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa. Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma; Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile. Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya: Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria. Nāchọnu Jehova na ike-Ya; Chọnu iru-Ya mb͕e nile. Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo; Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya; Unu nkpuru Abraham, bú orù-Ya, Umu Jekob, ndi-Ya arọputara. Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi: N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di. O chetawo ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu; Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara, Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak; O we me ka o guzoro Jebok ibu ukpuru, Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi: Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean, Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa: Mb͕e ha bu ndikom ole-na-ole, E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya; Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ, Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ. Ọ kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha; O we bara ndi-eze nba n'ihi ha; Si, Unu emetula ndim etere manu aka, Unu emejọ-kwa-la ndi-amumam.
ABÙ ỌMA 105:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nyenụ ONYENWE ANYị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ. Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile. Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ ONYENWE ANYị ṅụrịa. Na-achọnụ ONYENWE ANYị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile. Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta, unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara. Ya onwe ya bụ ONYENWE ANYị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile. Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ, ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik. O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi: “Aga m enye gị ala Kenan dịka oke i ga-eketa.” Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, nʼezie ha dị ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼime ya. Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa na mba ọzọ, sitekwa nʼotu alaeze gaa alaeze ọzọ. O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ; ọ baara ndị eze mba nʼihi ha; sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka; unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”